Saturday, April 11, 2020

Korona Vairọsụ by Ngozi Nwarunta

*Korona Vairọsụ*
Ọ bụ gịnị ka mmadụ kooro?
Ọ bụ onye ka a ga-akọrọ?
Hei! Korona Vaịrọsụ!

Òmèrè nwata na okenye
Òmèrè ọgaranya na ogbenye
Òmèrè ndị ọcha na ndị ojii
Ị na-ekokwasị ụkwara
Ị na-akpọchi ngụ̀
Onye chi ọjọọ ga-ekoro ọnwụ

Korona Vaịrọsụ!
Ị hụla ihe i mere?
Nne na nna, n'ụlọ
Ụmụaka, okenye, n'ụlọ
Ndị ụka, n'ụlọ
Onye úkwú, onye ntà, n'ụlọ
Òké n'ọhịa, ngwere n'ụzọ
Ebe i mere ha ndị nga
Ebe ị na-akpagharị
Achọ onye ị ga-ekote

Mà ka m jụọ gị Korona
Ọ bụ onye dunyere gị?
Ị ghara mmiri n'asaa
Ị ghara mba n'asaa
Gịnị mere ị nọghị na Wuhan?
Ebe ị malitere njem gị?

Mana ị dịkwa egwu Korona
Lekene ihe i mere mba Amerịka
Ị gbaala mba Itili ose n'anya
Mba Speen agaghị echefu gị
Ị sụọla mba ụwa dum akwụ

Ótù ihe ka m màrà
I kochaa, i koro ihe gị
I kochaa, i kofere anyị
I koro ihe gị laa
Ị gaghị ekote ụ́kwụ́ anyị
Ị gaghị ekote aka anyị
Maka na ndụ̀ anyị
Dị n'aka Chineke.
©nwarunta2020
nwarunta@gmail.com